18“Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị.
19Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu.
20Ma ndị Kohat ekwesighị ịbanye ilekwasị ihe nsọ ndị ahụ anya, ka ha ghara ịnwụ.”
21Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
22“Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.