Ọnụọgụgụ 4

Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise.

Numbers 4:23 (UKJV) From thirty years old and upward until fifty years old shall you number them; all that enter in to perform the service, to do the work in the tabernacle of the congregation.

21Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

22“Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

23Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise.

24“Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu.

25Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.