Ọnụọgụgụ 4

Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ

Numbers 4:47 (UKJV) From thirty years old and upward even unto fifty years old, every one that came to do the service of the ministry, and the service of the burden in the tabernacle of the congregation.

45Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Merari ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

46Otu a ka Mosis na Erọn na ndị ndu ụmụ Izrel si gụọ ndị Livayị niile ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

47Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ

48dị puku asatọ na narị ise na iri asatọ (8,580).

49Dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis si dị, e kenyere onye ọbụla ọrụ ya ma gwa ya ihe o kwesiri ibu. A gụrụ ha ọnụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.