7“Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
8Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
9“Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
10Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.
11“Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.