11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
12“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
13site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
14ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
15nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.