13site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
14ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
15nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
16“ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
17Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.