15nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
16“ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
17Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.
18Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
19Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ.