Ọnụọgụgụ 5

“Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.

Numbers 5:2 (UKJV) Command the children of Israel, that they put out of the camp every leper, and every one that has an issue, and whosoever is defiled by the dead:

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

2“Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.

3Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.”

4Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.