Ọnụọgụgụ 5

Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”

Numbers 5:22 (UKJV) And this water that causes the curse shall go into your bowels, to make your belly to swell, and your thigh to rot: And the woman shall say, Amen, amen.

20Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,”

21(nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko.

22Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”

23“ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.

24Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.