23“ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.
24Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.
25Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
26Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
27Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.