25Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
26Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
27Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
28Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
29“ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.