Ọnụọgụgụ 5

Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.

Numbers 5:28 (UKJV) And if the woman be not defiled, but be clean; then she shall be free, and shall conceive seed.

26Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.

27Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.

28Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.

29“ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.

30Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.