6“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.
7Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.
8Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.
9Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.
10Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ ”