10Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
11Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ.
12Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
13“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
14Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo,