Ọnụọgụgụ 6

Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

Numbers 6:22 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

20Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.

21“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”

22Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

23“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,

24“ ‘ “Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.