21“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”
22Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
23“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
24“ ‘ “Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,
25Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara,