2Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait,
3ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ.
4Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.
5“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
6“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,