19Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
20O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
21O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
22O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
23na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua.