34O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
35na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elizọ nwa Shedeua nyere.
36Nʼụbọchị nke ise Shelumiel nwa Zurishadai, onyendu ebo Simiọn butere onyinye nke ya.
37Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
38O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.