44O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
45O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
46O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
47na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere.
48Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.