Ọnụọgụgụ 7

Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.

Numbers 7:48 (UKJV) On the seventh day Elishama the son of Ammihud, prince of the children of Ephraim, offered:

46O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,

47na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere.

48Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.

49Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.

50O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.