Ọnụọgụgụ 7

Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya.

Numbers 7:54 (UKJV) On the eighth day offered Gamaliel the son of Pedahzur, prince of the children of Manasseh:

52O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,

53na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elishama nwa Amihud nyere.

54Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya.

55Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.

56O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.