50O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
51O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
52O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
53na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elishama nwa Amihud nyere.
54Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya.