87Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie.
88Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ. Ndị a niile bụ onyinye e nyere maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ.
89Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka Onyenwe anyị si gwa ya okwu.