Ọnụọgụgụ 8

“Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị.

Numbers 8:12 (UKJV) And the Levites shall lay their hands upon the heads of the bullocks: and you shall offer the one for a sin offering, and the other for a burnt offering, unto the LORD, to make an atonement for the Levites.

10Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha.

11Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee Onyenwe anyị nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere Onyenwe anyị ozi.

12“Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị.

13Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị.

14Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.