Ọnụọgụgụ 8

“Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha.

Numbers 8:15 (UKJV) And after that shall the Levites go in to do the service of the tabernacle of the congregation: and you shall cleanse them, and offer them for an offering.

13Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị.

14Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.

15“Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha.

16Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.

17Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.