Ọnụọgụgụ 8

Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.

Numbers 8:16 (UKJV) For they are wholly given unto me from among the children of Israel; instead of such as open every womb, even instead of the firstborn of all the children of Israel, have I taken them unto me.

14Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.

15“Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha.

16Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.

17Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt.

18Ewerela m ndị Livayị nʼọnọdụ ụmụ nwoke mbụ niile a mụrụ nʼIzrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.