23Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
24“Iwu m ndị a metụtara ndị Livayị niile. Nwoke onye Livayị ọbụla ga-ebido ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute m mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ise.
25Ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ nʼime ya mgbe ọ gbara iri afọ ise, mgbe oge ezumike ọrụ ya ga-amalite.
26Ha nwere ike inyere ụmụnne ha aka nʼịrụ ọrụ ha nʼime ụlọ nzute, ma ha onwe ha agaghị arụ ọrụ ahụ. Otu a ka ị ga-esi dozie ọrụ ije ozi nke ndị Livayị.”