1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2“Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’ ”
3Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
4Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.
5Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,