20Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha.
21Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha.
22Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ Izrel na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha.
23Site nʼiwu Onyenwe anyị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu Onyenwe anyị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile Onyenwe anyị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.