Ọnụọgụgụ 9

Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”

Numbers 9:3 (UKJV) In the fourteenth day of this month, at even, all of you shall keep it in his appointed season: according to all the rites of it, and according to all the ceremonies thereof, shall all of you keep it.

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya,

2“Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka.

3Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”

4Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga.

5Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.