Ọbadaya 1

I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.

Obadiah 1:14 (UKJV) Neither should you have stood in the crossway, to cut off those of his that did escape; neither should you have delivered up those of his that did remain in the day of distress.

12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.

13I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha.

14I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.

15“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.

16Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.