14I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.
15“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
16Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.
17Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
18Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.