17Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
18Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.
19Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.
20Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.
21Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.