21Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.
22Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.
23Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị.
24Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.
25Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.