Fịlịmọn 1

Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.

Philemon 1:5 (UKJV) Hearing of your love and faith, which you have toward the Lord Jesus, and toward all saints;

3Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.

4Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.

5Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.

6Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.

7Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.