1Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.
2Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.
3Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.
4Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.
5Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.