Ndị Filipai 1

Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.

Philippians 1:11 (UKJV) Being filled with the fruits of righteousness, which are by Jesus Christ, unto the glory and praise of God.

9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile.

10Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.

11Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.

12Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu.

13Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.