Ndị Filipai 1

Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.

Philippians 1:10 (UKJV) That all of you may approve things that are excellent; that all of you may be sincere and without offence till the day of Christ.

8Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs.

9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile.

10Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.

11Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.

12Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.