16Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma.
17Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ.
18Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile.
19Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.
20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.