Ndị Filipai 1

Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.

Philippians 1:19 (UKJV) For I know that this shall turn to my salvation through your prayer, and the supply of the Spirit of Jesus Christ,

17Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ.

18Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile.

19Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.

20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.

21Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.