2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
4Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ.
5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.
6Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.