Ndị Filipai 1

Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.

Philippians 1:3 (UKJV) I thank my God upon every remembrance of you,

1Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai.

2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.

3Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.

4Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ.

5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.