Ndị Filipai 1

Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.

Philippians 1:7 (UKJV) Even as it is meet for me to think this of you all, because I have you in my heart; inasmuch as both in my bonds, and in the defence and confirmation of the gospel, all of you all are partakers of my grace.

5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.

6Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.

7Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.

8Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs.

9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.