9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.
10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.
11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
12Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji.
13Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.