Ndị Filipai 2

Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.

Philippians 2:9 (UKJV) Wherefore God also has highly exalted him, and given him a name which is above every name:

7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ.

8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe.

9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.

10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.

11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.