Ndị Filipai 2

Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.

Philippians 2:16 (UKJV) Holding forth the word of life; that I may rejoice in the day of Christ, that I have not run in vain, neither laboured in vain.

14Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu.

15Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa!

16Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.

17Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ

18otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.