12Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji.
13Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.
14Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu.
15Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa!
16Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.