21Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst.
22Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.
23Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ.
24Nʼezie, enwere m olileanya na site nʼinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya.
25Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m.