Ndị Filipai 3

Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.

Philippians 3:17 (UKJV) Brethren, be followers together of me, and mark them which walk so as all of you have us for an example.

15Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.

16Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.

17Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.

18Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie.

19Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.